Ekene Maria (new video)

Ekene Maria, nne oma
I bu so gratia, nne oma 
Osebuluwa nonyere gi, nne oma
I bu nne nke Chukwu nne oma 
burukwa nne ora nine- nne yobara anyi ayiyo nne oma
Ezi nne anyi n’ekene gi
Ave ave ave ave Maria, i bu nne oma ah Virgin Maria ezi nne
Anokwa gi n’aka nne oma, a huru gi n’anya, (ezi nne), nne oma nara ekene anyi
Ave ave ave ave Maria, i bu nne oma ah Virgin Maria ezi nne.
Nne oma aa
Ekene Maria nne oma.
I bu so amala nne oma
i bu ifunanya nne oma
Chukwu doro gi nso nne oma
nara otito anyi.,  ezinne anyi n’ekene gi
Ave ave ave Maria, i bu nne oma ah Virgin Maria ezi nne
Ekene Maria nne oma,
Nne nke Jeso 
Nne onye nzoputa 
Nne nke nzuko 
Nne nke ezi n’ulo 
Kpakpando ututu
Kpakpando osimiri 
Nne nke okwukwe,yobara anyi ayiyo..ezi nne anyi n’ekene gi ..
Ave ave ave Maria, i bu nne oma ah Virgin Maria ezi nne
Ezinne Maria  nne oma, 
Nne nke ebere nne oma-ezinne i bu obi Chukwu nne oma..
obunadi  ndi no na mkpa nne oma- ezinne i na enekota ha nne oma.
Obunadi mgbe anyi n’oya, nne oma -ezinne i na enekota anyi..nne oma
N’ime uwa nile nne oma-  i na egosi ihunanya gi ezi nne  
I putara na Lourdes nne oma 
i putara na pontmain nne oma 
I putara na  Paris nne oma na La Salette nne oma-n’obodo nke France 
Nne oma ah -Virgin Maria  ezi nne. 
I putara na Portugal, nne oma n’obodo nke fatima: ibu nne oma a Virgin Maria ezi nneh
N’obodo nke Itali nne oma: 
I putara na Romu na San Luca  nne oma ah -nakwa Siracusa 
I putara na Messico na Guadalupe nne oma
I putara na Germany  nne oma 
I putara na Poland - nne oma
I putara na Irland nne oma
I putara na Belgium nne oma  
I putara n’Agentina  nne oma
I putara n’Amsterdam nne oma
I putara na Betania nne oma ah  na Venezuela - nne oma ah Virgin Maria ezinne
I putara na Japanu nne oma
I putara na Igiptu nne oma eh
I putara na Ruanda nne oma-  n’obodo nke  Kibeho - nne oma ah Virgin Maria ezinne.
N’ime obodo anyi  nne oma- obodo anyi Nigeria, ezi oma eh
I na egosi ifunanya gi ezi nne- nara otito anyi.
Ave ave ave ave Maria, i bu nne oma ah Virgin Maria ezi nne
Ezinne Maria nne oma 
Leekwa obodo anyi nne oma
Obodo anyi Nigeria nne oma eh
Kuru ya ka nwa nne oma eh
Etu i kuru Jisosu  nne oma eh
Nne wetara anyi udo.  nne oma eh
Wetara anyi amara gi  nne oma eh
Anyi nokwa gi n’aka.  nne oma eh
Obodo anyi nokwa gi n’aka  nne oma  eh
Nigeria nokwa gi n’aka nne oma eh
Uwa nine nokwa gi n’aka  nne oma ezi nne eh
Anyi chekwubere na gi nne oma  eh
yobara anyio ayiyo  nne oma eh
Ezinne anyi n’ekene gi. Ave, ave ave ave Maria i bu nne oma  ah Virgin maria ezi nne–
anokwagi n’aka nne oma- ahurum gi anya nne oma eh
Congregationm nokwa gi na aka nne oma eh
„Daughters of Mary, Mother of  Mercy“  nokwa gi n’aka, 
Umu Nwedo nokwa gi n’aka nne eh- yobara anyi ayiyo.
Ezinne anyi nekene gi: 
Ave ave ave ave Maria, i bu nne oma ah Virgin Maria ezi nne
Anokwam gi nne, a hurum gi n’anya nneh.
Anokwam gi n’aka nne, a hurum gi n’anya nneh - di aso
Ezi nne, Maria di asi, ezi nne  
Ekene Maria oh, Maria di asi, Maria oh, Maria di aso
I juputalu na gratia,Maria di aso, ezi nne eeeeh 
I di ngozi  (Maria di aso) n’etiti umu nwanyi nine oh, Maria di aso
Yelelelelem iyelelmyeoh iyelelelelem Yelelelelem iyelelmyeoh iyelelelelem  iye oh
Anyee anyee anyeo anye anyeeo anyeo  eehoooh Iya iya iya iya.